| Abstract: |
Isi okwu nchọcha a bụ ụsoro agụmaha ọgbara ọhụrụ n’Igbo Ẹzaa: Mmetụta ya nye usoro obibi ndụ n’ala
Igbo. Mbunuche nchọcha a bụ igosipụta ọnọdụ ịgụ aha ọgbara ọhụrụ n’Igbo Ẹzaa, iji si etu a gbochie mmetọ
a na-emetọ obibi ndụ ndị Igbo site n’ịgụ aha n’Igbo Ẹzaa; ma sikwa etu a kwalite ezi njirimara ndị Igbo. E
ji nleta nsonye na mkparịta ụka a hazighi ahazi mere ngwa nchọcha a. A gbasoro abụmoke nakwa agbata
afọ sere mmadụ iri na isii dị ka ndị njiri-mee nchọcha a. Ndị nchọcha dị ka otu n’ime ndị Igbo Ẹzaa ji
mmekọrịta n’ụdị mkparịta ụka nke na-adị n’etiti ha na ndị ha seere, nweta aha ndị Igbo Ẹzaa na-azagasị na
mpụtara ha n’otu n’otu. Aha ndị ahụ ka a gbasoro usoro ndekọ mkpụrụ okwu nweta, kpokoo ma họrọ ndị
tozuru dị ka njatụle maka ọrụ nchọcha a. A gbadoro ụkwụ n’atụtụ abụọ tọsaa ma tụchaa njatụle ndị ahụ a
họọrọ maka ọrụ a. Atụtụ abụọ ndị ahụ gụnyere: atụtụ asụsụ na omenala na atụtụ nsochi ọchịchị mbịara
chịwa. N’ikpeazụ, a chọpụtara na agụmaha n’Igbo Ẹzaa n’oge ugbu a ghasara aghasa n’enweghi otu usoro
a ma ama. Nke a ka a chọpụtakwara na ọ na-ebute oke ndakpọ nke usoro obibi ndụ n’Igbo Ẹzaa, nsiri-hụ
ụwa ndị Igbo, ọdịnala nakwa njirimara ndị Igbo Ẹzaa na Igbo n’izugbe ya. Nke a mere e ji tụta aro ka e
mee nchọcha metụta ụzọ nkwalite ezi aha e ji ama ndị Igbo. Ime nke a ga-enye aka n’ịkwalite aha Igbo,
ọdịnala na njirimara ndị Igbo, ọ bụghị sọ n’ala Naịjirịa kama na mpụga ya. |