| Abstract: |
Nchocha a nyochara nziputa onwu n’uzo mburu n’abu onwu di n’Akpa Uche. Mbunuche nchocha a bu ichoputa mburu ndi e ji ziputa onwu n’abu ndi a hooro, etu e si eji mburu eziputa onwu nakwa etu mburu ndi ahu si buru enyo e ji ahuta ndu ndi Igbo. Ndi ochocha gbadoro ukwu n’abu ano e dere n’onwu kpomkwem di n’Akpa Uche iji nweta ngwa nchocha. Atutu e ji mee nchocha bu atutu mmado mburu/atutu mburu ndinechiche nke Lakoff na Johnson. Site n’iji atutu a, oru nchocha a gosiri na mburu metutara echiche ma burukwa uzo mmadu si akowa etu o si ahuta uwa o bi n’ime ya. Na nchoputa e mere, a choputara na e nwegasiri mburu ndinechiche ndi odeabu e nyochara abu ha ji kowaa onwu. Mburu ndi a bu ‘ONWU BU IHE’, ‘ONWU BU MMADU’, ‘ONWU BU NDU’, na ‘ONWU BU NJEDEBE’. ‘ONWU BU MMADU’ kacha gbaa elu n’abu ndi e nyochara. Ndi odeabu ndi a ji nnochiaha ‘i, i, o, o, gi’ ziputa onwu dika mmadu nkiti na- eku ume. Mburu ndinechiche ndi a choputara gosiputara nkwenye na nhuruuwa ndi odeabu ndi e nyochara abu ha n’ihe gbasara onwu. Nke a gosiri na n’agbanyeghi na eziokwu di n’abu di mkpa, ihe kacha mkpa bu mma, nke a na-enweta site n’asusu. |