EJLLS Publication

EJLLS
Title: Nziputa Onwu N?uzo Mburu N?abu Onwu Di N?akpa Uche
Author(s): Chinedu C. EZEBUBE, Chioma M. AKAEZE & Ogechukwu F. U. CHUKWUNEKE
Abstract: Nchocha a nyochara nziputa onwu n?uzo mburu n?abu onwu di n?Akpa Uche. Mbunuche nchocha a bu ichoputa mburu ndi e ji ziputa onwu n?abu ndi a hooro, etu e si eji mburu eziputa onwu nakwa etu mburu ndi ahu si buru enyo e ji ahuta ndu ndi Igbo. Ndi ochocha gbadoro ukwu n?abu ano e dere n?onwu kpomkwem di n?Akpa Uche iji nweta ngwa nchocha. Atutu e ji mee nchocha bu atutu mmado mburu/atutu mburu ndinechiche nke Lakoff na Johnson. Site n?iji atutu a, oru nchocha a gosiri na mburu metutara echiche ma burukwa uzo mmadu si akowa etu o si ahuta uwa o bi n?ime ya. Na nchoputa e mere, a choputara na e nwegasiri mburu ndinechiche ndi odeabu e nyochara abu ha ji kowaa onwu. Mburu ndi a bu ?ONWU BU IHE?, ?ONWU BU MMADU?, ?ONWU BU NDU?, na ?ONWU BU NJEDEBE?. ?ONWU BU MMADU? kacha gbaa elu n?abu ndi e nyochara. Ndi odeabu ndi a ji nnochiaha ?i, i, o, o, gi? ziputa onwu dika mmadu nkiti na- eku ume. Mburu ndinechiche ndi a choputara gosiputara nkwenye na nhuruuwa ndi odeabu ndi e nyochara abu ha n?ihe gbasara onwu. Nke a gosiri na n?agbanyeghi na eziokwu di n?abu di mkpa, ihe kacha mkpa bu mma, nke a na-enweta site n?asusu.
Keywords: nchoca, nziputa, mburu, akpa