EJLLS Publication

EJLLS
Title: Ntule onodu na ekwumekwu mgborogwu na mkpa akwukwo na ndu ndi Igbo maka ogwugwo oria nakwa ahuike
Author(s): Ahamefula Ndubuisi Ogbonna, Ilechukwu Hypolite, Sabina Ngozi Nwokeji & Joy Adaeze Onuoha
Abstract: Nchọcha a gbadoro ụkwụ na ntule ọnọdụ na ekwumekwu mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ na ndụ ndị Igbo maka ọgwụgwọ ọrịa nakwa ahụike. Nchọcha a lebara anya na mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ dị iche iche e ji agwọ ọrịa n'oge gboo na ugbu a ma gaa n'ihu ịmata ọnọdụ ha n'oge ugbu a. Nchọcha a mere ka a mata na ọtụtụ mkpụrụ osisi anyị na-ata bụcha ọgwọ nnụ ọrịa n'ihi na e sitela na ha nwee ọgwụgwọ ọrịa dị iche iche. Obodo anọ ka eji mee ebe nchọcha nke nọchiri anya ala Igbo dịka nchọcha a si gbata kwụrụ. Usoro nnweta data bụ site n'ajụjụ ọnụ, nlebanya na ọba akwụkwọ dị iche iche. Ndị nchọcha ji aka ha were gaa ọhịa nchọcha nke mere ka ha dee ihe ndị ha gbatara n'ajụjụ ọnụ dịka e siri gwa ha. N'ime nchọcha a, ịchọpụta aha mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ dị iche iche e ji agwọ ọrịa n'oge ochie na ugbu a, inyocha ndịiche dị n'ekwumekwu e ji ere ọgwụ na mgbe ochie na ugbu a, ịchọpụta ndịiche dị n'usoro inye ọgwụ na ugboro ole mmadụ ga-anwụ ọgwụ n'oge ochie na ugbu a, ịmata ndịiche dị na ngwugwu ọgwụ maọbụ usoro nkechi ọgwụ n'oge ochie na ugbu a, bụcha ihe nchọcha a rụtụgasịrị aka.
Keywords: