EJLLS Publication

EJLLS
Title: Ndịnisi Okwu N’iduuazị Ubesie: Ịma Atụ Isi Akwụ Dara N’ala
Author(s): Agugu Matthias Odo
Abstract: Ndịnisi okwu, dị ka mmewere agụmagụ, bụ ihe ndị ahụ pụtara ihe na ndụ ndị mejupụtara ụwa iduuazị nke na-ezipụta onwe ya na mmewere iduuazị dị ka ndọkọ akụkọ, akparamagwa d.g. N’ihi mmekọrịta dị n’etiti odee na ọgụụ n’agụmagụ, odee na-ehi asaa n’anya họrọ ndịnisi okwu o nwere nke ga-enyere ya aka gwuzobe mpụtara na nhụmụwa ya n’ụdị ga-emetụta ọgụụ na mmụọ, nye ya obi aṅụrị, afọ ojuju, ncheta na agbamume. N’ọnọdụ iduuazị n’asụsụ Igbo, ọtụtụ kwenyere na o nweghi onye na-ede ka Ubesie, ma o nweghi onye Ubesie na-ede ka ya. Nka asụsụ ya, kewara ya na ndị ogbo ya, bụragodu mgbe ha na-ede n’otu isi okwu. A na-eche na n’ihi ụdị ndịnisi okwu Ubesie ji arụ ọrụ n’iduuazị ya, mere ndị ọgụụ ji enwekarị mmasị n’iduuazị ya. Nchọcha a lebara anya na ndịnisi okwu pụtara ihe n’iduuazị Isi Akwụ Dara N’ala nke Tony Ubesie. Mbunuche ebe a, bụ ịhọpụta ndịnisi okwu pụtara ihe n’iduuazị a, gosi ebe ha batara, ka odee siri jiri ha rụọ ọrụ na ihe o bu n’uche mee nke a. Nchọcha a, gbasoro usoro nka ndịma mma n’imejupụta mbunuche ya. N’ikpeazụ, nchọcha a chọpụtara na nhọ ndịnisi okwu Ubesie hibere isi n’ihe na-eme oge ugbu a na ndụ ndị Igbo. Ọ chọpụtakwara na e nweghi onye na-echere Ubesie aka mgba n’etiti ndị ogbo ya n’agụmagụ ederede Igbo, n’ihi na ndịnisi okwu ya n’akụkọ a rọrọ arọ Igbo bụ ọpụrụ iche.
Keywords: ndinisi, okwu