EJLLS Publication

EJLLS
Title: Mmetuta mmebi nkwurita okwu out onye na-asu nsu n'ebe mmekorita ya na mmadu ndi ozo no
Author(s): Ahamefula Ndubuisi Ogbonna & Onuh Esther Chidimma
Abstract: Nchọcha a lebara anya na mmetụta mmebi nkwurịta okwu otu onye nwere orịa ịsụ nsụ n'ebe mmekọrịta ha na ndị ọzọ nọ. Nkwụrịte okwu bụ mbido maọbụ ihe mgbakwasị ụkwụ n'ibe mmadụ na ibe ya nọ. Mbụnuche nchọcha a bụ ichọpụta etu ịsụ nsụ si emetụta mkparịtaụka dị n'etiti onye na-asụ nsụ na ndị anaghị asụ nsụ. Nchọcha a lebakwara anya na mmetụta ịsụ nsụ n'ebe ihe omụmụ dị tinyere mmetụta ịsụ nsụ n'ebe onye na-asụ nsụ nọ. E jiri nsoro nlere anya na ajụjụ ọnụ were nweta njiatụle e jiri mee nchọcha a. E jiri usoro nkọwa were hazie njiatụle nchọcha a. Ebe a nọrọ mee nchọcha a bụ n'ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị nke dị n'Okpo, Elugwu-Ezike ebe e nwetara otu nwata akwụkwọ na-asụ nsụ . Nchọpụta nchọcha a gosịrị na okwụ onye na-asụ nsụ na-ekwu anaghị edo ndị mmadụ anya nke na ọ na-emetụta ihe omụmụ ụmụaka a. Nchọpụta nchọcha a gosikwara na ịsụ nsụ na-eme ka onye na-asụ nsụ na-anọrọ onwe ya otụtụ oge ma na-enwe obị ịda mba oge ụfọdụ. Onye ọrịa ịsụ nsụ na-ekwugharị okwu ugboro ugboro. Ọ na-enwe ihe mgbochi n'ọwa akpọmụụda mgbe ọ na-ekwụ okwụ. Ọ na-ewe ya ogologo oge tupu o kwupụta ihe ọ chọrọ ikwu
Keywords: Ọkpụrụkpụ okwu ụfọdụ: Ịsụ nsụ, nkwurịta okwu, nkwugharị okwu, na mkpọbi okwu