EJLLS Publication

EJLLS
Title: Ime Okwu Isi Ububo
Author(s): Faith Chioma ONUOHA & Adaora Maudline EZE
Abstract: Ebumnobi nchocha a bu ikowaputa gbasara ime okwu isi ububo n’asusu Igbo.Nchocha a gara n’ihu kowaputa ihe ndi a na-ariba ama maka ime okwu isi ububo. Nchocha a lebakwara anya n’ihe ime okwu isi ububo na-ebutere ahiri okwu o metutara. O lebakwara anya ma o nwere nkeji asusu nke mbughari gbasara karia, ka o bu na ha niile na-anabatacha mbughari. Atutu a gbasoro mee nchocha a bu atutu izugbe mgbati nke Chomsky. A gbasoro usoro nleghari ?adim ? nsina uburu ? Ndi e jiri mee nchocha a bu ndi nkuzi nwoke na nwanyi bu ndi Igbo na-akuzi asusu Igbo n’ulo akwukwo ndi di na Mbaise na Obowo nakwa ihe ndi a gutara n’akwukwo. Nchocha a choputara na ihe kpatara atutu mgbanwe di iche iche e nwere bu maka iri mperi ndi nke bu ? uzo riri. Nchocha a choputara na, e mee okwu isi ububo, o na-agbakwunye echiche ohuru. o na-emekwa ka okwu ahu site n’onodu ya mbu noghar?a, biazie n’onodu ozo, nke butere ikpo ya isi okwu ububo ahu. Ihe ozo nchocha a choputara bu na o bughi otu udi nkeji asusu ka mbughari gbasara kama o nwere ike ibu nke o bula di ka mmeju ngwaa, omee, aha aka dg. o di mkpa ka ndi ozo leba anya n’udi agba mgbanwe ndi ?z? e nwere n’usoro okwu n’Igbo.
Keywords: Ime, ububo,isi