EJLLS Publication

EJLLS
Title: Ikikere Asusu n'Ikowa Ogwu Ahuike na Naijiria
Author(s): Crescentia UGWUONA
Abstract: E jighi ikikere asusu akowa ufodu ihe ndi metutara ndu okacha ahu ike ebuterela otutu mmadu onwu erughi eru, onwu mberede, nakwa otutu nsogbu ndi ozogasi n’obodo. Ebumnuche nchocha a bu igosiputa ikikere asusu n’ikowa na ichekwa ogwu ahuike na Naijiari site n’ituzi aka n’Igbo. Nchocha a chokwara igosiputa njirimara na uru ikikere asusu; n’akwa ihe enweghi ikikere asusu na-ebute n’ihe gbasara ogwu ahuike. Onye nchocha gbadoro ukwu n’ atutu nhoro na atutu ntucha ububo wee kowaa isiokwu a. Nchocha a choputara na ikikere asusu na-enyere mmadu aka n’ikowaputa echiche ya etu o ga-edo anya ka a ghara inwe nsogbu okacha onwu mberede n’ihi ajo nkowa; ikikere asusu na-enye aka n’belata otutu nsogbu a na-enwetakari n’ihi nkowa e nyere gbasara okwu ahuike . Onye nchocha na-akwadokwa ka e nwee ikikere asusu; ka o ga-abu onye nwere ezi ihe o ga-akowaputara oha na eze nwee ohere ime ya, ma o guru akwukwo ma o gughi akwukwo.
Keywords: Igbo, ikikere asusu, ogwu, ahuike, nknwa, oha na eze