EJLLS Publication
EJLLS| Title: | Ikikere Asusu n'Ikowa Ogwu Ahuike na Naijiria |
| Author(s): | Crescentia UGWUONA |
| Abstract: | E jighi ikikere asusu akowa ufodu ihe ndi metutara ndu okacha ahu ike ebuterela otutu mmadu onwu erughi eru, onwu mberede, nakwa otutu nsogbu ndi ozogasi n?obodo. Ebumnuche nchocha a bu igosiputa ikikere asusu n?ikowa na ichekwa ogwu ahuike na Naijiari site n?ituzi aka n?Igbo. Nchocha a chokwara igosiputa njirimara na uru ikikere asusu; n?akwa ihe enweghi ikikere asusu na-ebute n?ihe gbasara ogwu ahuike. Onye nchocha gbadoro ukwu n? atutu nhoro na atutu ntucha ububo wee kowaa isiokwu a. Nchocha a choputara na ikikere asusu na-enyere mmadu aka n?ikowaputa echiche ya etu o ga-edo anya ka a ghara inwe nsogbu okacha onwu mberede n?ihi ajo nkowa; ikikere asusu na-enye aka n?belata otutu nsogbu a na-enwetakari n?ihi nkowa e nyere gbasara okwu ahuike . Onye nchocha na-akwadokwa ka e nwee ikikere asusu; ka o ga-abu onye nwere ezi ihe o ga-akowaputara oha na eze nwee ohere ime ya, ma o guru akwukwo ma o gughi akwukwo. |
| Keywords: | Igbo, ikikere asusu, ogwu, ahuike, nknwa, oha na eze |