| Abstract: |
Agumagu bu enyo e ji ahu uwa na obibi ya. Agumagu a haziri nke oma ga-agbara umuaka uwa ha n’anwu site n’agwa ndi e gosiputara na ya. Ha ga-ahuta iheoma nke ga-enyere ha aka na ndu, huta ihe ojoo nke nwere ike iduhie ha uzo ma ha akpachaghi anya, hutakwa ihe mgbagwoju any na, ogbagharii nke ga-eme ka ha cheba echiche ime banyere ndu mmadu, aku na uba, ochichi, ekpemekpe na ekwemekwe nakwa ihe ndi ozo ha ga-ahuta di ka o siri metuta mmadu site n’usoro ihe mere eme na omenanro. Agumagu umuaka malitere n’oge gboo site n’akuko ifo nke a na-akoro ha. Akuko ndi a na-enye ha obi a?uri, ha esite n’ime ya muta ihe. Ma n’oge ugbu a, agumagu umuaka na-ekweke isi, anaghi akoziri umuaka akuko onu dika o di na mbu. N’aka nke ha, umuaka anaghi agukwa ihe ogugu, onodu di otu a agaghi enye ha ohere ito eto na itokasi uwa ha mara ihe kwesiri ime na nke ha ekwesighi ime maka mwulite ndu ha na nke Africa. O bu ebe a ka edemede a gbadoro ukwu, ileba anya n’ihe butere onodu a na mkpa agumagu di na ndu umuaka. Atutu e jiri dee ederede a gbadoro ukwu na nke echemeche nke Jean Piaget, Erik Erikson, na Lawrence Kohlberg mere, banyere ntolite umuaka. E jiri akwukwo ogugu iduuazi ‘Mmiri Oku E Ji Egbu Mbe’ nke Tony Ubesie wee mee nchocha a. Achoputara na ahumihe, onodu uwa na gburugburu agwa Enyi nke a kporo aha n’akwukwo a jikoro aka onu hiwe agwa na nhumiihe nwatakiri a. O bara n’otu ojoo, gakwaa mkporo, ma chegharia nwetazie aka oru nke Akanke nyeere ya aka oge o putara. Anyi nyekwara ntuziaka ka a na-akoro umuaka udi akuko a ma o bu ka ha na-agu udi iduuazi a maka nzulite na nwulite ndu ha bu nke e chere ga-enye aka maka mmepe obodo n’odinihu. |